Saturday, 02 August 2014

In order to view this object you need Flash Player 9+ support!

Get Adobe Flash player

Àwà Vishọ̀n

affiliate Ka anyị bụrụ
ndị a na-̀àchọsi
ike maka iweta ojijeozi
banyere asụsụ
ndị nke Afịrịka.

Gụ̀kwuo

Àwà Mishọ̀n

Our MissionAnyị nà-ejìri asụ̀sụ nke ndịahịa gị kpanyere ndịahịa gị ụkà maka orire ahịa, inweta ndàbere na ntụkwàsịobi nke ndịahịa n’ahịa gị maọbụ mgbanwe nke ụdị obibi ndụ.

Gụ̀kwuo

Na-èlelite

special N’oke mmasị maọbụ pashọ̀n
N’eziokwu
Imē n’ogè
Etu gafechara ogo nkitị

Gụ̀kwuo

Òjijeozi dị icheiche

Òjijeozi nke XML maka Asụ̀sụ nà-èwepụ̀tagasị ọrụ ntụgharịasụsụ, mbufèozi (lokalaịzeshọn), nkụzi, mpịpụ̀ta edemede nà nhàzi edemede maka ịkụ̄pụta/ibipụ̀tà ya n’igwè, ntàpịaokwu maọbụ nsụgharịasụ̀sụ bàa n’asụsụ ọzọ, iji olu mmadụ kwuputa edemede, nà ọrụnchọcha dị̄ icheiche.


Nkenke nkọwa ihe niile

Ntụgharịasụ̀sụ | Ẹdo, Ẹfik, Fulani, Hausa, Ìgbò, Kanuri & Yorùbá.

Nkwàdo na-adịgide 24/7

Dèjuo akwụkwọ anyi jì ànakọta ozi nke dị n’ọ̀wàozi Ịntanet, obi sìkwaa gị ike nà ị gà-anata nzaghàchi.

XML Language Services

Òjijeozi nke XML maka Asụ̀sụ nà-èwepụ̀tagasị ọrụ ntụgharịasụsụ, mbufèozi (lokalaịzeshọn), nkụzi, mpịpụ̀ta edemede nà nhàzi edemede maka ịkụ̄pụta/ibipụ̀tà ya n’igwè, ntàpịaokwu maọbụ nsụgharịasụ̀sụ bàa n’asụsụ ọzọ, iji olu mmadụ kwuputa edemede, nà ọrụnchọcha dị̄ icheiche.
Anyị bụ obi nke ojijeozi asụsụ nye onyeọbụla (mà GỊ) nke chọrọ kà a tụgharịara ya ọrụ ya dị nà Bèkeè wèe tinye ya n’ime nke ọbụla n’ime asụ̀sụ Naịjiria ndị e jì àgara Gọọmentị̀ nà ọ̀hàmmadụ ozi: Ẹdo, Ẹfik, Fulani, Hausa, Ìgbò, Kanuri na Yorùbá.
Ndị so n’òtùọrụ̄ anyị bụ̀gàsị̀ ndịọ̀kàasụ̀sụ (lịngwists) na ndị na-asụ asụsụ ha dịka asụsụ nke aka ha.
A hàzìrì ihe mēre anyị ihe anyị bụ, kà ọ na-ezùte mkpa gị maka asụsụ n’ogè, mà wèrekwa usòrò nchekwa mmā kacha dị elu wee na-eme nke à. Ntụgharịasụsụ nà mbufèozi anyị bụ nke na-ezipụta ǹjìrìmara sitere na Nkwà maka Ọdịdị Mma Nke Usoroọrụ, bụ nke a mààrà dịkà NMNN - Ntụgharịasụsụ, Mbufèozi, Nhàziedemede, na Nhọ̀chaedemede. Nke a kà anyị na-etinye n’ọrụ n’ahịrịokwu ọbụla, ka anyị wee nweta akwụkwọ edemede dị mkpà nke ndejọ ọbụla adịghị na ya.

Gụ̀kwuo...